Ụmụnwaanyị na-agba bọọlụ na-enwe enyi nwoke - Blessing Okpe

Aha onyonyo, Ụmụnwaanyị na-agba bọọlụ na-enwe enyi nwoke - Blessing Okpe
Ụmụnwaanyị na-agba bọọlụ na-enwe enyi nwoke - Blessing Okpe
Mgbe e biputara ya

Blessing Okpe na-agbara otu egwu bọọlụ ụmụnwaanyị Nigeria Super Falcons bọọlụ, apụtala kwuo hoo ha na ụmụnwaanyị na-agba bọọlụ na-enwekwa enyi nwoke ma na-alụkwa di.

Blessing kwuru nke a oge ya na BBC News nwere mkparịtaụka dịka Nigeria ji ọkpụ goolu ise merie mba Comoros n'asọmpi iji tozuo oke maka egwuregwu Olympics nke afọ 2028.

N'okwu ya "O nwere echiche ndị mmadụ na-eche na ụmụnwaanyị na-agba bọọlụ anaghị alụ di maọbụ ha anaghị enwe enyi nwoke. Ha na-enwe enyi nwoke nke ọma. Mụ onwe m nwekwara enyi nwoke nke m. Ọ na-agbakwa bọọlụ".

Blessing kọwaara anyị etu njem ya dịka ọgbaabọọlụ si malite.

"Amalitere m ịgba bọọlụ oge m dị afọ itoolu. Ana m eso ụmụnwoke agba bọọlụ tupu m gaa Lagos. Ọ bụzi ebe ahụ ka nọrọ na-ahụ ụlọọzụzụ tupu mụ onwe m abanye n'ụlọọzụzụ", ka owuru.

Ọ gara n'ihu kwuo: "Ọ bụ na Lagos state ka m siri gaa gbaa na COD Ladies. Esi m COD Ladies gaa Ibom Angels. Ahapụrụ m Ibom Angels gaa Rivers Angels. Ọ bụ na Rivers Angels ka m siri gaa asọmpi ụmụnwaanyị na-akarịbeghị afọ 20 n'afọ 2022.

Ọ kọwara etu njem mba ofesi ya si malite ma kwuo ọtụtụ otu egwu bọọlụ mba ofesi ọ gbagooro bọọlụ ma kwuo etu o si nweta oku ịgbara Super Falcons Nigeria bọọlụ.

"Esi m n'otu ụmụnwaanyị na-akarịbeghị afọ 20 laghachi na Rivers Angels. Ọ bụ na Rivers [Angels] ka m siri gaa mba ofesi, gbaa bọọlụ na Turkey. Aha otu egwu bọọlụ m na Turkey bụ Amed Sport".

Esi m Amed Sport gaa Belarus, gbaa league mbụ m na Belarus n'ime otu egwu bọọlụ Dinamo Minsk. Agbachara m na Dinamo Minsk, gaa Mogilev FC. Ọ bụ na Mogilev FC ka ndị nkụzi Super Falcons hụrụ m, ma kpọọ m ka m bịa soro ha gbaa.