Ọtụtụ mmadụ anaghị ahụta m ka nwaanyị maka na m gbara ahụọnụ - Nwada Jennifer

Aha onyonyo, "Ọtụtụ mmadụ anaghị ahụta m ka nwaanyị maka na m gbara ahụọnụ" - Nwada Jennifer
Ọtụtụ mmadụ anaghị ahụta m ka nwaanyị maka na m gbara ahụọnụ - Nwada Jennifer
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
  • Mgbe e biputara ya

Jennifer Ifedimma Okpala bụ nwaada gbara ahụọnụ ka nwoke, bụ nke a maara dịka 'hirsutism' n'asụsụ Bekee.

Oge ya na BBC nwere mkparịtaụka pụrụiche, ọ kọwara na ọnọdụ a malitere mgbe ọ dị afọ iri na asaa, bụ mgbe ọ nọ na klaazị nke ise n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị.

"Mgbe ahụ ọ pụtara, ọ bụrụ na m na-ele onwe m anya n'enyo, ihe m na-ahụ anaghị amasị m. M na-ajụ chi m ihe mere m jiri bute ihe niile a. O mekwara obi anaghị esi m ike igosipụta onwe m n'ọha. Na-agbanyeghị etu ọbụla m siri chee ya, ọ na-adị m ka onye e tinyere n'ime karama na-anaghị emegharị ahụ," ka nwaada Okpala kọwara.

Jennifer Okpala kwuru na 'hirsutism' emeela ka ọtụtụ mmadụ ghara ịhụta ya dịka nwaanyị, n'ihi na ha echeghị na ọ dị etu nwaanyị kwesịrị ịdị.

Oge ọ na-akọwa nke a, nwaada Okpala sịrị: "Mgbe gị na ụmụnwaanyị ibe gị ga na-eme ihe, ndị ọzọ na-agafe n'ụzọ ga na-ahụta gị dịka onye dị iche n'ihe ha chere nwaanyị kwesịrị ịdị ka ya".

"Ọtụtụ oge, ọ bụrụ na m na-aga n'ụzọ, ndị mmadụ a na-ekwu ihe masịrị ha, na-achọ ihe ndị ha ga-eme ka obi jọọ m njọ. Ndị mmadụ na-akọcha m."

Jennifer Okpala kwuru na ya emeela ihe dị iche iche iji gbochie ọnọdụ a, mana o nweghị nke nwere isi.

"Kemgbe m malitere ịhụ ajị a n'ahụ m, o nwebeghị ihe ndị m na-emebeghị, ma nke a sị a ga-aṅụ aṅụ ma nke a asị a ga-agba agba. Emechaala m ha. Mana emechara m ha, ọ dịzie ka ajị ọ pụtara n'ike".

"Emechaala m ya hụzie na ajị na-amụbawanye, m sịzie na ọ baghị uru na m gara n'ihu na-eme ya ma na-ata ndụ m ahụhụ. M hapụzie ajị ndị a ka ha na-apụtara onwe ha, maka na dịka m na-ele ajị a, o nweghị ihe ọ nọchiri, kama ọ bụ na ndị mmadụ anaghị enwe mmasị ịhụ ya."

O nyere ụmụnwaanyị nwere ọnọdụ 'hirsutism' ndụmọdụ ka ha ghara iji maka na ha gbara ajị ọnụ nọrọ n'ime ụlọ maọbụ kpọchigide onwe ha ụzọ, n'ihi na ọ bụrụ na ha apụtaghị n'ọha, o nweghị onye ga-anabata ha.