Mgbe a gụpụtara ebubo ndị e boro Mmụọ Mmili Afụlụanya n'ụlọikpe
Mgbe a gụpụtara ebubo ndị e boro Mmụọ Mmili Afụlụanya n'ụlọikpe
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist and Video Journalist
- Mgbe e biputara ya
Ikechukwu Ezenagu a maara dịka Mmụọ Mmili Afụlụanya wuchiri n'Ụlọikpe Ukwu Anambra Steeti dị n'Awka n'ụbọchị Wenezde 3 Juun 2026 maka ebubo ịgwọ ọgwụ okeite gọọmenti steeti ahụ boro ya.
Oge a gụpụtachara ebubo ndị e boro ya, Ọkaikpe Jude Obiora nyere iwu ka e jichie Mmụọ Mmili Afụlụanya n'ụlọmkpọrọ dị n'Amawbia ruo n'ụbọchị ọzọ a ga-elebara okwu ya anya.
Ọkaikpe Obiora kwupụtara ụbọchị 19 Juun 2026 dịka mgbe ọzọ Mmụọ Mmili Afụlụanya ga-abịa n'ụlọikpe.
Cheta na otu Agunechemba nwuchiri nwadibịa ahụ n'ụbọchị Tọzde 12 Maachị 2026 make ebubo ịda iwu nchekwa 'Homeland Security Law, ma boo ebubo na Ezenagu na-arata ụmụokoroọbịa na ụmuagbọghọ na-ekwe ha nkwa ibute ego ọsịsọ ma ọ bụru na ha saa ahụ na mmiri dị n'azụ ụlọ ya.



