O nwere ebe 200 naịra ga-akpọga gị ugbua?
Ego mmanụ ụgbọala arịgorola elu ma mee ka ego ụgbọala agbalie elu n'ebe niile na Naịjirịa.
Ọndọdụ a na-enye ọtụtụ ndị mmadụ nọ na Naịjirịa nnukwu nsogbu.
Akụkọ a na-ele ugboro ole e bugoro ego mmanụ ụgbọala elu na Naịjirịa na etu o si emetụta obibi ndụ na Naịjirịa.
End of Akụkọ gbasara ego mmanụ ụgbọala
Ugboro ole ka e buliri ego mmanụ ụgbọala na Naịjirịa site n'afọ 1999 ruo 2026?
Kemgbe Onyeisiala Tinubu bara n'ọchịchị na Mee 2023, Naịjirịa a hụla mbuli elu ọnụego mmanụ ụgbọala karịa mgbe niile.
Ụbọchị Mee 29, 2023, n'agbanyeghị na Onyeisiala Bụharị (nke nwụrụ anwụ) na-atụle okwu iwepụ maọbụ ịhapụ ego enyemaka 'subsidy'.
Okwu izizi OnyeisialaTinubu ji nabata ọkwa ya, ka o ji kwuo na ego enyemaka 'subsidy' abụrụla ihe gara aga. Nke a bụ mbido oke ego mmanụ ụgbọala site 195 naịra ruo 1350 naịra a na-ere ya ugbua.
Lee etu ego ole mmanụ ụgbọala si rịa elu kamgbe 1999 ruo ugbua:
N'afọ 1999 ruo 2007, oge Onyeisiala Obasanjo na-achị, e bidoro ire mmanụ ụgbọala ₦20, o mechara ruo ₦30 n'afọ asatọ o jiri bụrụ Onyeisiala.
Mana n'afọ 2004 ruo 2007, ego mmanụ ụgbọala dara ₦22, ma mechaa gaa elu ruo ₦65–₦75 n'afọ 2004 ruo afọ 2007.
Malite n'afọ 2007 ruo 2010, Onyeisiala Yar'Adua wedatara ego mmanụ ụgbọala ma hapụ ya na ₦65 site ₦75. Ka Yar'adua nwụrụ n'ọkwa dịka Onyeisiala, Onyeisiala Goodluck Jonathan chịrị Naịjirịa site 2010–2015.
Ọ nwara iwepụ ego enyemaka 'subsidy' n'afọ 2012, nke buliri ọnụego mmanụ ụgbọala ruo ₦141, ha mechara budata ya ka ọ bụrụ ₦97 kwa lita, mana o bugara ya na ₦87 naịra tupu ọ pụọ n'ọchịchị n'afọ 2015.
N'oge Onyeisiala Buhari chịrị Naijirịa n'afọ 2015–2023, ego mmanụ ụgbọala nọ na ₦87 rigoro ₦145, e mechara bulie ya n'afọ 2022 ruo 2023 nke ebugara site ₦175 ruo ₦199.
N'ọnwa Mee ruo Juun 2023, Onyeisiala Tinubu wepụrụ ego enyemaka mmanụ ụgbọala nke mere ka ego ọnụahịa mmanụ ụgbọala jiri site na ₦195–₦200 ruo ₦500, nke ụfọdụ bidoro rewe ₦617 kwa lita n'ọnwa Julaị 2023.
____________________________________________________________________________
Gaa na BBCIgbo.com maka akụkọ mba ụwa ma n'ala Igbo, n'asụsụ Igbo
Soro anyị n'Ịnstagram @bbcnewsigbo , Facebook BBC News Igbo ma sorokwa anyị na Whatsapp Chanelụ anyị na bbc Igbo



