'Ọtụtụ ụmụnwoke na-edina nwoke na Naịjirịa lụrụ nwaanyị iji mesaa ọha anya' - Innocent

Aha onyonyo, Innocent Okechukwu:‘Ọtụtụ ụmụnwoke na-edina nwoke na Naijiria lụrụ nwaanyị iji mesa ọha anya’
'Ọtụtụ ụmụnwoke na-edina nwoke na Naịjirịa lụrụ nwaanyị iji mesaa ọha anya' - Innocent

Innocent Ndubuisi Okechukwu bụ onye odeegwu (song composer) ma ihe ekwe na-akụ n'iti egwu ụka nke ndịisi ojii nakwa egwu Oyibo a kpọrọ ‘Orchestra’.

Okechukwu bụ nwaafọ Ideatọ n’Imo steeti.

O depụtala ọtụtụ egwụ e ji aka ụka, emerube mmemme ma mee obiụtọ.

Egwu ndị o degoro gụnyere; 'Oku Ncheghari'; Ije Uwa; 'Ọjị' na 'When the world is sick'.

Aha Okechukwu kpọtụrụ akpọtụ na Naijiria nsonso a mana ọ bụghị maka egwu, kama ọ bụ mąka na ya na nwoke ibe ya gbara akwụkwọ n'otu ụloụka dị n’Amerịka.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere nsonso a, nwaafọ Imo steeti ahụ kwuru na ọtụtụ ụmụ Naịjirịa na-akatọ agbamakwụkwọ ha bụ meremere n’ihu, gwọmpụtụ n’azụ, dịka nwaanyí ha lụrụ bụ iji mesa ọha anya.

Okechukwu sịrị, “Meremere n’ihu, gwọpụtụ n’azụ dị na Naijiria karịrị akarị. Dịka onye nhazi na onye nkuzi egwu na onye ọkpọ ụbọ (pianist) jegoro mpaghara dị iche iche na Naijiria, ezutela m ọtụtu ụmụnwoke na Naijria na-edina nwoke ibe ha, mana ha lụrụ nwaanyị, nwee ụmụ iji kpuchie onwe ha.”

Okechukwu kwuru nke a dịka ọtụtụ ụmụ Naijiria katọrọ ya oge foto agbamakwụkwọ ya na di ya bụ Greg Colombe gbara n’ Amerịka wuru na soshal midia.

Ụfọdụ ụmụafọ Igbo katọrọ maka ya aka iji okpu ọdịnaala a na-akpọ 'okpu diọkpa' were mee agbamakwụkwọ ahụ. Ha sị na o megidere omenala Igbo nweoke ịlụ nwoke ibe ya.

Okechukwu sara sị, “A bịa n’okpu mmemme m, nke anyị kpu n’agbamakwụkwọ, ihe m nwere ịsa ha bụ na o nweghị onye e mere onye nchekwa uwe na eyimeyi omenala ọbụla. Anyị nile gba ọtọ bịa ụwa.”

“Ọ dị ka onye otu nzuzo na-enye iwu sị gị eyila uwe mmemme maọbụ nke ojii, onye nyere ha ikike?”

Innocent Ndubuisi Okechukwu na Greg Colombe gbara akwụkwọ n'Amerịka n'afọ 2026.

Ebe foto si, Innocent Okechukwu

Ihe ndị i kwesịrị ịma maka Innocent Ndubuisi Okechukwu

  • Innocent Ndubuisi Okechukwu bụ onye odeeegwu na-ada ụda.
  • Ọ bụ onye Imo steeti mana a mụrụ ya na Delta steeti.
  • Ọ gara mahadum 'University of Nigeria Nsukka'(UNN) ebe ọ gụrụ maka egwu.
  • Ọ gụrụ 'Masters' n'ide egwu na Longy School of Music of Bard College, Cambridge – USA.