"Anyị ga-echekwa Eze Charles na nwunye ya n'Amerịka" - Onyeisiala Donald Trump

Aha onyonyo, "Anyị ga-echekwa Eze Charles na nwunye n'Amerịka" - Onyeisiala Donald Trump
"Anyị ga-echekwa Eze Charles na nwunye ya n'Amerịka" - Onyeisiala Donald Trump

Onyeisiala Donald Trump ekwuola na enweghị ihe ọbụla ga-eme Eze Charles na nwunye ya Camilla dịka ha na-eme njem abalị anọ na mba Amerịka.

Nke a na-abịa dị onye nnọchiteanya mba UK n'Amerịka bụ Christian Turner kwuru na njem Eze Charles and nwunye ya ga-aga n'ihu n'agbanyeghị mwakpo Allen Cole wakporo ọgbakọ Onyeisiala Trump na ndị ntaakụkọ nwere na Washington n'ụbọchị Satọde abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Eprel.

Turner kwuru na njem Eze Charles na nwunye ya ga-amalite n'ụbọchị Mọnde 27 Eprel, 2026 bụ iji wulite ezi mmekọ dị n'etiti Amerịka na UK.

Praịm minista UK bụ Keir Starmer kwuru na ya na ndịisi ọchịchị Amerịka enweela mkparịtaụka banyere ọnọdụ nchekwa ma kpebie na njem ahụ ga-aga n'ihu.

E kwuru na a gbanwere ụfọdụ ihe banyere njem ahụ iji gbochie ihe ọbụla nwere ike ibute nsogbu.

A na-atụ anya na Onyeisiala Donald Trump ga-anabata Eze Charles na nwunye ya n'obi ọchịchị White House Amerịka n'ụbọchị Mọnde na njem abalị anọ ahụ ha ga-eme.

Njem a na-abịa dịka mmekọ dị n'etiti Amerịka na UK ji otu ụkwụ kwụrụ.

Nke a bụ maka na Onyeisiala Trump katọrọ Praịm minista Starmer maka na ọ kwadoghị Amerịka n'agha ha na Ịran.

Eze Charles ga-abụ Eze Briten mbụ ga-agwa ụlọomeiwu Amerịka okwu kemgbe Ezenwaanyị Elizabeth n'afọ 1991.

Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ọkọlọtọ Amerịka na Briten na-efegharị n'obi ọchịchị White House dịka a na-atụ anya mkpụrụ njem abalị anọ ga-amịta.