Ego ole Onyeisiala Bola Tinubu biiri n'ụlọakụ mbaụwa kemgbe afọ 2023
Ụlọọrụ na-ahụ maka mbibi ego n'ụlọakụ mbaụwa bụ International Developement Association (IDA) ekwuola na Naịjirịa ka ji ọkwa dịka mba atọ kachasị ebiri ego n'ụlọakụ mbaụwa a kpọrọ World Bank n'olu bekee.
Akwụkwọ ozi ha wepụtara n'ọnwa Maachị 2026, kwuru na ego ole Naịjirịa biiri n'afọ Onyeisiala Tinubu nọ n'ọchịchị bụ ijeri dọla iri na asatọ na nde narị ise ($18.5b)
Ha kwuru na mba kachasị ebiri ego n'ụlọakụ mbaụwa bụ Bangladesh ebe Pakịstan bụ mba abụọ kachasị ebiri ego n'ụlọakụ ahụ.
Cheta na nso nso a, na ụlọakụ mbaụwa mechiri ebe e si ezitere ha ozi na soshal midia dịka akụkọ kwuru na ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa degara ha ozi katọrọ oke ego Naịjirịa na-ebiri.
Mana ka anyị lee anya n'ugboro ole Onyeisiala Bola Tinubu biiri ego n'ụlọakụ mbaụwa kemgbe ọ banyere n'ọchịchị n'ọnwa Mee, 2023.
N'ọnwa Juun 2023, ụlọakụ mbaụwa binyere Naịjirịa nde narị dọla asaa na iri ise ($750) maka iwulite ọnọdụ ọkụ latrik nakwa nde narị dọla ise ($500m) maka ịkwalite ọnọdụ ụmụnwaanyị.
N'ọnwa Julaị 2023, Naịjirịa biiri ego ruru nde narị dọla asatọ ($800m) iji belata mmetụta iwepụ ego enyemaka mmanụ ụgbọala bụ 'fuel subsidy'.
Naịjirịa bitere nde narị dọla asaa ($700m) maka atụmatụ Adolescent Girls Initiative for Learning and Empowerment nke bụ maka ịkwalite ọnọdụ agụmakwụkwọ nye ụmụnwaanyị. Nke a mere na Septemba, 2023.
N'ọnwa Juun 2024, ụlọakụ mbaụwa binyere Naịjirịa ijeri dọla abụọ, nde iri abụọ na ise ($2.25b) iji kwado ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa nke a kpọrọ Economic Stabilization and Resource Mobilization Reforms.
Na Septemba 2024, Naịjirịa bitere otu ijeri dọla na nde iri ise na asaa ($1.57b) maka ịkwalite agụmaakwụkwọ, ọnọdụ ahụike nakwa ọnọdụ ọkụ latrik.
A bịa n'afọ 2025 ruo afọ 2026, ụlọakụ mbaụwa binyere Naịjirịa nde narị dọla isii na iri atọ na abụọ ($632m) maka nkwalite ihe oriri nakwa agụmaakwụkwọ, ijeri dọla atọ ($3b) maka ịrụ okporo ụgbọoloko ebe a ka na-eche ka a kwado mbibi ijeri dọla na nde iri abụọ na ise ($1.25b) Naịjirịa kwuru na ọ chọrọ iji kwalite ọnọdụ akụnaụba.



