Gịnị mere EFCC ji kwupụta ọzọ na ha na-achọ Maina bụbu onyeisi ụlọọrụ Pension Reform Task Team?

 Abdulrasheed Maina

Ebe foto si, MEDIAMAFIA

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ gbasara akụ na ụba na ego bụ 'Economic and Financial Crimes Commission' (EFCC) ekwuputala ọzọ na ha na-achọ onye bụbu onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mgbanwe n'usoro nchịkwa ego ezumike nka Pension Reform Task Team (PRTT), bụ Abdulrasheed Maina.

Ụlọọrụ EFCC wepụtara ozi ahụ n'ụbọchị Wenezde 23 Septemba 2026 dịka ọ gachara ọnwa ole na ole Maina nọchara nga afọ asatọ nke a tụrụ ya.

Ha kwuru na ihe mere ha ji achọ onye bụbu onyeisi ngalaba na-ahụ maka ego ezumike nka bụ n'ihi njikọ o nwere n'okwu gbasara 'ebubo ịnata ihe ndị e zuru ohi.'

Ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Dele Oyewale, gwara ndị mmadụ nwere ozi bara uru gbasara Maina ka ha gaa kọọrọ ụlọọrụ ha.

Cheta na nke a abụghị mbụ ụlọọrụ ahụ na Maina na-enwe nsogbu dịka ụlọọrụ kwupụtara n'afọ 2015 na ha na-achọ onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mgbanwe n'usoro nchịkwa ego ezumike nka, achọ.

A gwara ya mgbe ahụ ka ọ bịa kọwaa ọrụ ya n'ihe ụlọọrụ ahụ kọwara dịka nkwekọrịta 'biometric' jupụtara n'aghụghọ, nke a na-ebo ya ebubo na o tinyere aka na ya.

EFCC boro ya na onye bụbu onyeisi ndị ọrụ gọọmentị (Head of Service) bụ Steve Oronsaye, na mmadụ abụọ ọzọ, ebubo na ha zuru ego ezumike nka ruru ihe karịrị ijeri naira abụọ.

Chetakwa na ọ bụ n'ọnwa Nọvemba afọ 202, ka ụlọikpe kasị elu nke Gọọmentị Etiti dị n'Abuja mara Maina ikpe ịga mkpọrọ afọ asatọ ka a chọpụtachara na aka ya dị n'izubata ego n'ụzọ iwu na-akwadoghị bụ 'money laundering' n'olu bekee.

Onye ọkaikpe bụ Okon Abang, onye gụpụtara mkpebi ikpe ahụ kwuru na Maina zuru ego ụgwọ ezumike nka karịrị ijeri naira abụọ.

Onye bụ Abdulrasheed Maina?

A mụrụ Abdulrasheed Maina n'obodo ya dị n'okpuru ọchịchị Biu, na Borno steeti nke Nigeria, n'ihe dịka afọ 1950.

Abdulrasheed Maina lụrụ Laila Maina, ha mụtakwara ụmụ; otu n'ime ụmụ ha, bụ Faisal Maina bụ onye a tụrụ mkpọrọ afọ iri na anọ maka ebubo izubata ego n'ụzọ iwu na-akwadoghị nke bekee kpọrọ 'money laundering'.

Tupu Maina abụrụ onyeisi nke otu 'Pension Reform Task Team' (PRTT), ọ rụrụ ọrụ dịka onye nchịkwa dị elu na ngalaba na-ahụ maka ego ezumike nka nke ndị ọrụ Customs, Immigration, na Prison (CIPPO) ruo ọtụtụ afọ.

N'afọ 2010, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onyeisioche nke PRTT, ka o wee duzie otu ahụ site n'afọ 2010 ruo 2013.

Akwụkwọ ozi ebe ụlọọrụ EFCC kwupụtara na ha na-achọ Abdulrasheed Maina achọ ọzọ

Ebe foto si, Official EFCC/X