Ejije ịga okwu nwaanyị m mere mepere anya m maka alụmdinanwunye nke m – Funnybone

Aha onyonyo, ‘Ọrụ ịkpa ọchị abụghịzị ọrụ ndị ofeke, kwado onye ọbụla chọrọ ịrụ ya’ – Funnybone
Ejije ịga okwu nwaanyị m mere mepere anya m maka alụmdinanwunye nke m – Funnybone
Mgbe e biputara ya

Onye na-arụ ọrụ ikpa ọha ọchị a ma ama bụ Stanley Chibunna Julian nke ọtụtụ ji Funnybone mara kọwara etu o siri banye ọrụ a.

Chibunna kwuru na ọ gụrụ ime ihe onyonyo n’akwụkwọ na mahadum ma malite ime ya bụ ihe kemgbe ọ matara ihe n’ime ụlọụka.

N’okwu ya o kwuru: “Kemgbe m dị na nwata, mmadụ niile na-ekwu na m kwesịrị ịbụ onye ọrụ ịkpa ndị mmadụ obi aṅụrị.”

Ọ kọwara na agbanyeghị na nna ya akwadoghị ya bụ ọrụ, nne ya dọnyere ya ukwu nke bụ na ọ na-ahazịrị ya ụzọ ịpụ n’abalị gaa emume ịkpa ọchị na Kaduna bụ ebe a mụrụ ya.

O kwukwara na ọrụ a bụ ọrụ ka na-atụ ọha n’anya dịka ha na-eche na ọ bụghị ọrụ mmadụ ga-arụ were bụrụ mmadụ.

Funnybone onye ọrụ ịkpa ọchị
Nkọwa foto, Funnybone onye ọrụ ịkpa ọchị na nwunye ya.

Ọ kọwara “Ndị igbo anaghị akwanyere ndị na-anaghị arụ ọrụ aka, ọrụ onyibo maọbụ onye na-azụ ahịa ugwu”.

Ugbua, Chibunna na-emezị ihe onyonyo na-eme ejije tinyere ọrụ ịkpa ndị mmadụ ọchị.

O kwuru na ewezuga ihe ndị na-echere ọrụ a aka mgbe na ọdịnaihu ya bụ ọrụ chakere achake.

Funnybone onye ọrụ ịkpa ọchị
Nkọwa foto, Funnybone onye ọrụ ịkpa ọchị
Funnybone na ndị enyi ya
Nkọwa foto, Funnybone na ndị enyi ya

Otu n’ime ihe o kwuru bụ ọgbatauhie n’ọrụ ndị na-akpa ọchị na Naịjirịa bụ na ihe onyonyo na-emepụta bụ n’efu dịka ndị mmadụ anaghị akwụ ụgwọ leele ya n’ịntanetị.

Ka o si kwuo, nke a mere na ndị mmadụ na-ezuru ihe onyonyo ha na-ekesa etu o siri sọ ha.

‘Ọrụ ịkpa ọchị abụghịzị ọrụ ndị ofeke, kwado onye ọbụla chọrọ ịrụ ya’ - Funnybone

Ọ kọwara na teknụzụ na-enyere ndị na-eti egwu nakwa ndị na-eme ejije aka inyopụta ma mmachị nzufu ọrụ ha adịbeghị ire nye ndị ọrụ ịkpa ọchị.

Chibunna onye mechapụrụ agbamakwụkwọ ya na nso nso a kọwara na dịka ọ bụ onye na-emesapụ ahụ ma na-agara ndị mmadụ emume nke ha na obi dị ya ezigbo mma etu ọha ọkachasị ndị a ma ama n’ọrụ ịkpa ndị mmadụ obi aṅụrị siri bịara ya emume agbamakwụkwọ ya nke wuru ewu. Kirie ihe onyonyo a n’uju ka ị nụrụ ihe ndị ọzọ o kwuru.