Obi na-adị m ụtọ na m na-eme ndị mmadụ obi aṅụrị na soshal midia
Nwamadị a bụ Muorugoro Casmir Chukwuebuka na-eji ngosipụta akụrụngwa ụmụanụmanụ na ihe ndị ọzọ dị iche iche akpa ndị mmadụ ọchị na soshal midia akọwaala etu njem ya si malite.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, ọ kọwara na ọ bụ site na iji akpụkpọ ụkwụụ nna ya nwụrụ ka o jiri malite ịrụpụta ọtụtụ ihe ngosi o ji akpa ndị mmadụ ọchị.
O kwuru na ihe ọbụla o mepụtara bụ ihe o ji akọ akụkọ dị iche iche banyere ihe na-eme na gburu gburu ya.
Nwamadị a bụ onye gụrụ akwụkwọ na mahadum Naịjirịa dị na Nsukka na ngalaba ọmụmụ ihe 'Fine and Applied Arts' kwuru na obi dị ya mma na ọ na-eme ndị mmadụ obi aṅụrị na soshal midia, kama na ọ bụ ya bụ isi ihe ọ na-eme.
O kwuru na ihe mere o ji arụpụta ihe niile a bụ igosi ụmụ ụwa aka ọrụ ya pụrụiche, ka o nwee ike nwete ohere ọrụ na mba ofesi.
N'okwu ya;
"Mgbe m malitere ọfụma bụ n’afọ 2021 mgbe nrụgharịrị akpụkpụ ụkwụ nna m nwụrụ anwụ, mgbe ọ nwụrụ, ụlọ anyị niile jụrụ oyi, nne m na-akwa akwa, onye ọbụla nọọ na nkịtị, mwee sị ka m ghara ịnọ na nkịtị, mwee legharịa anya hụụ akpụkpụ ụkwụ ya (nna m), ọnụ ya pịrị apị, mwee sị ka m mee ya ka o buo ibu, amaghị m ihe kpalitere mmụọ m mana m sị ka m mee ya. Ọ bụ ya bụ ihe onyonyo mbụ m fesara na soshal midia nke m ji mee njirimaara ‘Ianumeh’, ọ gara mba ofesi, ọtụtụ ndị a ma ama kesara ya.
Mwee lee ya anya hụụ na ọ bụ ihe baara uru ka m na-eme, m sịzie ka m mere ya na-aga ka ọ bụrụ ihe pụrụiche banyere ụdịrị nka m na-eme maka na nka na-abịa n’ụdị dị iche iche.
Ana m eme ihe dị iche iche, m na-akwa akwa ka m si kwuo na mbụ nne m na-akwa akwa, eji m akwa arụgaasị ihe dị iche iche, nke ụfọdụ n’ime nwe ihe ọ pụtara ebe ụfọdụ enweghi ihe ha pụtara.
Abịara m ruọ nnukwu uwe suut nke pụtara ibu arụ ndị ụwa bunyere mmadu na-ajụghị onye ahụ etu ụwa si adịrị ya, ọ bu ya kpalitere mmụọ m ịrụ ya. Ihe ndị ọzọ m na-rụgasị gụnyere anụ mmiri na ala ‘penguin’, ihe kpalitere ya bụ mgbe otu penguin na-ewu na soshal midia maka na ọ hapụrụ ebe ibe ya nọọ si ụzọ ọzọ, na-emekaarị ihe nke ya iche, i lee anya ihe ahụ metụtara m maka na ọ bụ etu ndụ m dị, anaghị m eso n’iwu ndị mmadụ, ana m ekewapụta nke m, etu ahụ penguin ahụ si gaa iche ka si rụpụta ya.
Ihe kpalitere mmụọ m ịrụpụta ọkụkọ bụ na elere m anya hụụ etu ndị mmadụ si egbusi ọkụkọ n’oge ekeresimesi, m wee sị ọ bụrụ na m rụọ ọkụkọ a ka o buo ibu ka mmadụ ma na-eme mmadụ etu a e si eme ya kwa oge emume ọbụla, kedụ ka ọ ga-adị?
Ihe ndị ọ mụtaara m bụ n’afọ gara aga (2025) e nwere ndị odeakwụkwọ si mba ofesi bịa zụrụ foto ndị m rụpụtara na nnukwu ego, nke ahụ bụ otu n’ime ya. Ọzọ bụ ime ka m bụrụ onye a ma ama, ebe ọbụla m gara, ụfọdọ na-amata m sị ọkwa gị na-eme ihe a? Ya bụ ihe gosiri na ihe m na-eme baara uru.
Ihe mere m ji ebu ya aba n’ime ahịa bụ ebe onye ọbụla ga-ahụ gị, ọ bụghị ebe zoro ezo. Agaghị m atụ asị, ọ na-eme ihere oge ụfọdụ maka na ọ bụghị ihe m kwadoro ime n’ụwa mana dịka obodo si dị ugbua, ikpa aṅụrị bụ ihe na-enyezi ego.
Obi na-adị m aṅụrị na m na-eme ndị mmadụ obi aṅụrị na soshal midia nakwa n’ihe mana ọ bụghị kpatara m ji eme ihe a m na-eme. Ihe kpatara m ji eme ya bụ ka m nwete ezi ohere n’ọdịnihu na mba ofesi nakwa ọrụ, iji gosi ha na ihe a bụ akaraka m."
Kirie ihe o kwuru n'uju;



