Ala Igbo nwere ihe niile ga-eme ka egwu gị wuo ewu - Slowdog
- Onye dere ya, Michael Ngene na Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist na Video Journalist
- Mgbe e biputara ya
Otiegwu Nnenna Okechukwu Emmanuel onye e ji Slowdog mara, agwala BBC Igbo na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa nwere ihe niile ga-eme ka onye otiegwu ọbụla nọ na mpaghara ahụ malite iwu ewu nke ukwuu.
Slowdog kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere ma kwuo na oge agaala mgbe ọ bụ naanị Legọs nwere ihe ịga-eme ka egwu mmadụ malite iwu ewu.
O kwukwara ihe mere o ji kpebie ịnọ n'Enugwu steeti n'agbanyeghị na ọtụtụ mmadụ kwenyere na ọ bụ na Legọs ga-eme ka egwu wuo ewu.
N'okwu ya "Ọ bụ ụlọmgbasaozi mere o ji dịka Legọs bụ e jechaa agwụ n'ihe gbasara egwu, oge ahụ agaala maka na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa nwere niile ga-eme ka otiegwu ọbụla malite iwu ewu nke ukwuu".
Slowdog gara n'ihu gbaa ọtụtụ ihe n'anwụ banyere njem egwu ya, mmekọ ya na ndị egwu ụfọdụ gụnyere Phyno, Mr Raw, Tjay nakwa ọtụtụ ndị ọzọ.
Otu ihe ọzọ gbara ọkpụrụkpụ Slowdog gbara n'anwụ na mkparịtaụka bụ na ọ chọrọ ịkwụsị ịza 'Slowdog'.
O kwuru na Slowdog na-ada ka aha ndị GenZ ma kwuo na ọ ga-amalite ịza Mazi Okechukwu maọbụ Mazi Diggy.
Banyere akụkọ na e nwere nwaanyị ọ chọrọ ịlụ, Slowdog kwuru hoo ha na ya agaghị aza ajụjụ ọbụla maka ya n'ihi na nke ahụ bụ gbasara naanị ya.



