Nne m nyere m ego m ji tipụta egwu mbụ m - Zyno

Aha onyonyo, Nne m nyere m ego m ji tipụta egwu mbụ m - Zyno
Nne m nyere m ego m ji tipụta egwu mbụ m - Zyno
Mgbe e biputara ya

Otiegwu Urama Henry Olisaemeka a maara dịka Zyno Topboy akọwaala etu nne ya si nye ya narị naịra asaa (N700) o ji tie egwu mbụ ya oge ọ ka nọ ụlọakwụkwọ sekọndrị.

Na mkparịtaụka anyị na ya nwere, Zyno kwuru na ya na ndị enyi ya iri na otu bụ ihe malitere itikọ egwu mana ugbua, ọ bụ naanị ya ka na-eti egwu ta.

"Anyị nọ n'ụlọakwụkwọ sekọndrị oge anyị malitere itikọ egwu mana ọ bụ naanị m n-eti egwu ugbua".

O kwuru na oge ọ malitere iti egwu, ọ na-elegara Phyno na Flavor anya maka na ha bụ ndị Igbo egwu ha na-ada ụda.

Banyere akụkọ na egwu anaghị enye nnukwu ego, Zyno mere ka o doo anya na ọ bụ site n'egwu ka o ji zụọ ụgbọala ya, malite azụmahịa ọ na-eme ma na-enyere ụfọdụ ndị ezinaụlọ ya aka.

Ọ kpọrọ oku ka ndị na-eti egwu na-amalite iwepụ aka ha n'ịṅụ mmanya maọbụ anwụrụ ike iji nweta uche ha ga-eji dee egwu.

"Mmanya maọbụ anwụrụ anaghị eme ka ị dee ezigbo egwu", ọ bụrụ na i nweghị onyinye ịgụ maọbụ dee egwu, enweghị mmanya maọbụ anwụrụ ọbụla ị ga-ese ga-eme ka i dee ezigbo egwu", ka Zyno kwuru.