I nwereike igbochi m, mana ị ka bụ nna m

Aha onyonyo, I nwereike igbochi m, mana ị ka bụ nna m
I nwereike igbochi m, mana ị ka bụ nna m

Cathy bụ otu n'ime ọtụtụ ụmụaka na mba Kenya nna ha bụ ndịagha mba Briten. Nna Cathy na ụmụaka ndị ọzọ a ruru otu narị, hapụrụ ha tupu a mụọ ha.

Nne ụmụaka ndị a tara oke ahụhụ ileta ụmụaka ndị a.

Cathy chọpụtara nna ya na Facebook ma zigara ya ozi mana o gbochiri ya izitere ya ozi.

Nne Cathy kọwara etu nna Cathy bụ Phil si eku Cathy n'aka oge ọ dị ntakịrị.

Cathy chere na nna ya anwụọla, ruo oge ọ chọpụtara akara Facebook ya oge ọ dị afọ iri.

Nna Cathy bụ otu n'ime ndịagha mba Briten mụrụ ụmụaka ruru otu narị n'akụkụ ogige a na-azụ ndịagha na mba Kenya kemgbe ọtụtụ afọ

Mana ụlọọrụ nnyocha BBC World of Secret na Africa Eye achọpụtala etu ụlọikpe ezinaụlọ mba UK si jiri DNA achọpụta nna ndị a ma kpọtụrụ ha.

Nna Cathy mechra kwuo etu obi dị ya oge o wetara ozi Cathy ma kwukwaa etu agha ọ gara na mba Afghanistan si metụta ya nd ndị enyi ya ndị ọzọ.

Mịnịstrị nchekwa kwuru na n'agbanyeghị na okwu gbasara onye mụrụ nwa bụ ihe dịịrị onye, gọọmenti UK na mba Kenya na-arụkọ ọrụ n'esemokwu gbasara onye mụrụ nwa.