Ihu mmadụ abụọ ụlọikpe tụrụ nga mkpụrụọka maka iyi ọha egwu na Naịjirịa

Aha onyonyo, Ihu mmadụ abụọ ụlọikpe tụrụ nga mkpụrụọka maka iyi ọha egwu na Naịjirịa
Ihu mmadụ abụọ ụlọikpe tụrụ nga mkpụrụọka maka iyi ọha egwu na Naịjirịa
Mgbe e biputara ya

Ụlọikpe Ukwu Etiti Naịjirịa dị n'Abuja atụọla ndịisi abụọ otu na-eyi ọha egwu a kpọrọ Ansaru nga mkpụrụọka.

Mana ọ bụ gịnị ka Abubakar Abba a maara dịka Abu Baraa na Mahmud Usman mere nke mere ka Ọkaikpe Emeka Nwite tụụ ha nga mkụrụọka?

Ọ dị mkpa ka ị mara na ndị ọrụ nchekwa DSS nwụchiri Abubakar na Mahmud n'ime ọnwa Mee na Julaị 2025 ma bo ha ebubo 32 gụnyere mpụ, iyi ọha egwu, ịkwado ndị na-eyi ọha egwu, imepụta ogbunigwe nakwa ebubo ndị ọzọ.

DSS kwuru na mmadụ abụọ a bụ ndị otu Ansaru bụ otu na-eyi ọha egwu e kwuru na ha na otu Al-Qaeda na-enwe mmekọ.

Oge mbụ a kpụpụrụ ha n'ụlọikpe n'ọnwa Septemba, 2025, gọọmenti Naịjirịa kwuru na mmadụ abụọ a hiwere ọtụtụ otu na-eyi ọha egwu n'ebe dị iche iche na Naịjirịa ma bụrụkwa ndị nọ n'isi ọtụtụ mwakpo na ntọrị e mere na mpaghara Naịjirịa dị iche iche n'ime afọ iri gara aga.

Ụfọdụ mwakpo ndị e kwuru na ha mere gụnyere mwakpo ụlọ mkpọrọ Kuje dị n'Abuja na Julaị 2022, mwakpo ogige ndịagha Naịjirịa dị na Wawa Niger steeti n'afọ 2022.

E kwuru na ọ bụ ha wakporo ma tọrọ ịnjinịa nwafọ mba Fransị aha ya bụ Francis Collomp n'afọ 2013, Alhaji Musa Umar Uba n'afọ 2019 nakwa ọtụtụ mwakpo ndị ọzọ.

N'ikpe ya n'ụbọchị Mọnde 20 Julaị, 2026, Ọkaikpe Emeka Nwite kwuru na Abubakar na Mahmud kwetara n'ebubo ndị ahụ e boro ha nke mere ka ọ tụọ ha nga mkpụrụọka.

Mana ụlọọrụ DSS kwuru hoo ha na ha anabataghị nga mkpụrụọka ahụ Ọkaikpe Nwite tụrụ mmadụ abụọ ahụ.

Otu onyeisi n'ụlọọrụ ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya, kwuru na ụlọọrụ DSS ga-ewega ikpe ahụ n'ụlọikpe mkpegharị maka na ha anabataghị nga mkpụrụọka ahụ Ọkaikpe Nwite tụrụ Abubakar na Mahmud.

O kwuru hoo ha na nga mkpụrụọka a tụrụ mmadụ abụọ ahụ ejughị ha afọ ma kwuo na ọ bụ ikpe ọnwụ ka ha chọrọ ka a maa ha maka mpụ, mwakpo nakwa atụtụ ihe ọjọọ ha mere.

O kọwara na ọ dịghị mma ịhapụ mmadụ abụọ a gburu ma tinye tụtụ ezinaụlọ n'oke ihe mgbu ka ha dịrị ndụ ma kwuo na ọ bụ naanị ikpe ọnwụ bụ ihe ha na-achọ n'aka ụlọikpe.