Ghana,Gabon na mba ndị ọzọ tinyere aka n'Agha Biafra na Naịjiria na ihe ha mere

Yakubu Gowon na Emeka odumegwu Ojukwu

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Agha Bịafra, nke a lụrụ site n'afọ 1967 ruo afọ 1970, abụghị naanị esemokwu ime obodo, kama ọ bụ ọgbaghara mba ụwa tinyere aka n'ụdị dị iche iche, nke gbanwere usoro agha ahụ nke ukwuu.

Ụfọdụ mba dị n Afrịka, Yurop, na ebe ndị ọzọ rụrụ nnukwu ọrụ site na mmekọrịta mba na mba, enyemaka ndị agha, na ọrụ ebere.

Lee ụfọdụ n'ime ha nakwa ihe ha mere:

Gana

Na mbido agha Biafra , mba Ghana bu obodo mbụ pụtara dịka onye ọkpaudo.

N'ọnwa Jenụwarị afọ 1967, ọchịagha Gana bụ Joseph Ankrah bụ onye haziri ọgbakọ udo n' Aburi, ebe ndị ọchịagha Naịjirịa abụọ na-ese okwu bụ Yakubu Gowon na Chukwuemeka Ojukwu, bịara ka a chọta ụzọ ikpezii esemokwu ahụ n'udo.

Nkwekọrịta e nwere n'Aburi nyere olileanya na mbido, kama enweghị ezi nghọta na mkpebi emere dị n'etiti Ojukwu na Gowon, kpalitere esemokwu ahụ ọzọ nke mepere ụzọ ka akụkụ abụọ ịlụ agha.

Soviet Union

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ka agha ahụ tiwapụrụ, ndị ọchịchị mba ụwa kewara n'akụkụ abụọ; ụfọdụ kwadoro Naịjirịa, ebe ụfọdụ nọrọ na-akwado mba Bịafra na-achọ ikewapụ onwe ya.

Mba 'Soviet Union'' kwadoro Naịjirịa site n'inye ha ngwa agha dị iche iche.

Briten

Mba Briten bụ ndị jịkọtara Naijiria achọghị ka Biafra si na Naijiria kewapụ.

Ya mere ha nyere Naijiria nkwado ngwaagha, chenkwa ọbọ mmepụta mmanụ Shell nakwa nkwado mmekọrịta mba na mba.

Ijipt

Mba 'Egypt' nyeere Naịjirịa nkwado na ịlụ agha n'ikuku site na izitere ha ndị na-efe ụgbọelu eji alụ agha.

Amerịka

Mba Amerika na Izrel tinyeere aka n'ọrụ enyemaka site n'inye nri na enyemaka dị iche iche nye ọha na eze.

Fransị

Na-agbanyeghị na Biafra enweghi nnabata na mba ụwa, ha nwetara nkwado site n'aka ụfọdụ obodo dị iche iche.

Otu n'ime ha bụ mba Fransi.

Mba ahụ kwupụtara n'ihu ọha na o nweghị onye ha na-akwado n'etiti Naịjirịa na Bịafra, kama ọtụtụ akụkọ kwuru na Fransị zitere enyemaka ndịagha na nzuzo na ndị ọrụ enyemaka na mpaghara Bịafra.

Pọtụgal

Mba Portugal rụkwara nnukwu ọrụ n'ịhazi ka ụgbọelu na-ebu ngwaagha na ihe enyemaka gafee n'ala dị n'okpuru ọchịchị São Tomé.

Gabọn

Gabọn kwadoro Biafra site na ịbụ ebe nyere ohere na ọnyinye enyemaka si mba ofesi na abata Biafra.

Gabọn, n'oge Ọchịchị Onyeisiala Omar Bongo, mepere ụzọ mba ahụ nabata ndị si Biafra gbaa ọsọ ndụ nke gụnyere ụmụaka.

Gabọn so na mba anọ n'Afrịka kwupụtara n'ihu ọha na ha nabatara Bịafra dịka mba kwụrụ onwe ya.

Ndị otu a gụnyere: Ivọri Kọst (Côte d'Ivoire), Tanzanịa, na Zambịa.

Agha Bịafra kpalitere nnukwu ọgbaghara na ahụhụ nye mmadụ, nke butere ajọ ụnwụ nri gbasara ebe nile na mpaghara Bịafra.