E jila obi gị niile akwado mmadụ na ntuliaka maka ngharịpụ - Chude Jideonwo
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Onye dere ya, Chinonso Orji Nnachi
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Onye dere ya, Emmanuel James
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Mgbe e biputara ya
Onye ntaakụkọ aha ya na-ada ụda na Naijiria bụ Chude Jidenwo adụọla ụmụ Naijiria ọdụ ka ha ghara i nwe oke ntụwasịobi n'onye ọbụla ha na-akwado maka ntuliaka, sị na nndtị ahụ pụrụ ịgharịpụ ha.
Jidenwo, onye ji onwe ya maa atụ kwuru na o nyere Muhammadu Buhari nkwado pụrụ iche oge achụmtavootu mana Buahri wụrụ ya n'ala site n'ihe o mere n'ọkwa ọchịchị.
"Agbanyeghị ka obi gị si anọ ọkụ maka onye ọbụla, wetuo obi. O nwere ike gaa ọfụma, nwee ike ọ gaghị aga.Ya mere na anaghị m eme mkpọtụ 'candidate'."
"Oge m mere achụmtavootu na 2015 mana ọ gaghị ka m si chee na ọ ga-aga. Ndị mmadụ chere na m ga-aga otu akụkụ mana agara m akụkụ nke ọzọ.Mụnwa chere na 'candidate' m Buhari,dị mma. M bịa jiri obi m, ma aka m, ma ndụ tinye n' ikwụpụta maka onye ahụ. E mechaa ihe nile ghasaa. Were rue taa, ya bụ ihe amasịghị ndị mmadụ. Ka nke a mechara. Ewere rue taa, ha gbagharabeghị m maka achụmtavootu ahụ mere."
Onye ntaakụkọ aha ya na-ada ụda na Naijiria bụ Chude Jidenwo
Jidenwo akọwarala ihe mere na ọ lụbeghị nwaanyị na-agbanyeghị na o tozuola ihe e ji nwoke eme ma nwee ka ọganihu n’ọrụ ya.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere na nsonso a, Chude kwuru sị, “ Ihe gbasara nwunye na ụmụ abụghị ihe ị ga-eme n’oge ndị mmadụ. Ọ bụ n’oge gị, oge chi gị sịrị na o ruo.Ya mere ọ ga-aga. Mụ na nne m na-ekwu okwu ya mgbe nile. Mgbe chi m sị, ‘Chude, gawa’, ọ bụrụ ya.”
Chude Jideonwo bụ nwata a na-arị eze n’ọrụ ntaakụkọ.
Onye Obimkpa dị n’Okpuru Ọchịchị Aniọcha na Delta Steeti.
A mụrụ Chude na Legọs ọ gụọ akwụkwọ ya n;’ile na Naijiria.
Nwaamadi ahụ gurụ maka Iwu na mahadum ‘University of Lagos’ arụọla ọrụ n’ụlọntaakụkọ dị iche iche gụnyere; NTA, ThisDay, Comet nke a mazi dịka ‘Nation’ wdg.
Jidenwo ehiwerela ọtụtu ụlọọrụ mgbasaozi gụnyere; ‘RedAfrica, Ynaija nakwa Futureawards.
Na mkparịtaụka ahụ, Jideonwu kọwara ihe mere na ndị ogbo ya ndị ntaakukọ aka ochie enweghị nka soshal midia,nakwa oge ụmụ Naijiria dọrọ ya vamvamvam na soshal midia maka ịkwado aka chịburu Naijiria bụ Muhammadu Buhari. Ma tụọ arịrị na Buhari wụrụ ya n’ala site ka ọchịchị ya si gaa na-agbanyeghị nkwado ya ji obi ya nye ma mere ya achụmmntavootu.
Kirie ihe ụfọdụ o kwuru n'ihe onyonyo dị n'elu ma gụọ n’uju ọsịsa ajụjụ ya n'okpuru:
Ajụjụ na ọsịsa Chude nyere
Kọwaara anyị onye ị bụ.
Aha m bụ Chude Jidenwo, Abụ m onye ntaakụkọ, A mụrụ na Ijesha, Legọs mana ebe m si bịa bụ Ọbọmkpa dí n' Okpuru Ọchịchị Aniocha na Delta steeti.
Gị na Ned Nwoko abụ nwanne?
Mụ na Ned nwoke bụ nwanne n'ezie. Nakwa ọtụtụ ndị ọzọ dịka Nduka Irabor, Nduka Obiagbena, Tony Elumelu, anyị si otu mpaghara.
E bidoro m ọrụ a(ọrụ ntaakụkọ) oge ndị afọ 15. Agara m akwụkwo Sekọndrị na Mayflower, Ikenne
E bidoro ọrụ ntaakụkọ na NTA oge m dị afọ 15 n'aka Livi Ajuọnuma na Sunday Show. Kemgbe ahụ, afọ a(2026) ga-eme ya afọ 26 m bidoro ọrụ a. Arụọla m ihe nile ma TV ma redio ma akwụkwọ akụkọ, ma magazin; NTA,MBI, NTA2, NTA 10, Thisday, Guardian,wdg.
Emeela m ha nile , ya bụ anọbaala m ime n'ọrụ ntaakụkọ na Naijiria.
Agara m akwụkwọ m nile na Naijiria.
Agara m akwụkwọ ọtakara na praịmarị na 'Kid's Court Nursery and Primary School' dị na Surulere, Legọs. Agara m Sekọndrị n'Adebola Baptist High School', maka JS 1.Agara m Ogun Steeti maka maka JS rue SS2. Agụrụ m maka Iwu na mahadum 'University of Lagos', gaa 'Law School' n'Abuja. 'Masters' bụ na Pan Atlantic University, Legọs, Naijiria. Ya mere, a mụrụ, m too, mee ihe nile na Naịjira.
Onye ọbụla ma gị dịka onye ntaakụkọ. Kedụ ihe kpatara na ị gụghị 'Mass Communication', ga gụọ maka 'Law'?
Ihe mere m na-agụghị' Mass Communication' bụ na
mgbe m na-eto, nne m gwara m na ị gụọ 'Mass Communication', ị gaghị enwe ohere ịrụ dịka ọkaiwu. Mana ị gụọ maka Iwu, ị ga-enwe ohere ịrụ dịka onye ntaakụkọ.
Ezinaụlọ m bụ ezinaụlọ ndị ọkaiwu; nnukwu nna m bụ ọkaiwu. ụmụnne nna m atọ bụkwa ndị ọkaiwu.
Ọrụ ntaakụko abụghị ọrụ maka ndị na-eti eto=I dịak ọrụ teknụzụ, mmanụ agbịdị maọbụ ndọrọndọrọ ọchịchị?
Kemgbe m dị na nwatakịrị, ọrụ ntaakụkọ bụ naanị ihe m chọrọ ime
M hụ akwụkwọakụkọ, ede m aha onye odee ọbula m hụrụ n'ime ya. M na-ekiri ihe onyonyo TV, onye ntaakụkọ ọbụla m hụrụ, edetuo m aha ya, sí na achọrọ m izute ya, achọrọ ịdịka ya.
Malite mgbe m dị afọ asaa, ọrụ a bụ ihe m chọrọ ime, o nweghị ihe ọzọ.
Mgbe m nọ n na Sekọndrị,m nọ na 'press club,' m dee , dee, Osote Onyeisi ụlọakwụkwọ anyị bịa kpọọ m nzukọ sị, 'Mba,mba, o zuela.' Ị na-agụ akwụkwọ ị bịara ịgụ n'ụlọakwụkwọ a ị gụ ka ị na-eme 'press club'?
M bịa buru mpụtara ule gosi ya sị, 'Ana m eme ọfụma'.
Ọ bịa hapụ, ya mere Kemgbe m di ntakịrị, ọrụ ntaakụkọ ka m chọrọ ime.
Kedụ ndị ịna-elegara anya mgbe ị na-eto mere iji sị na ọ bụ ọrụ ntaakụkọ ka ị ga-arụ?
Ndị ntaakụkọ ndị nọrọ ọdụ n'ọrụ a. Kemgbe m dị na nwata. Ha riri nne.
Funmi Iyanda, livi Ajuonuma,Oby Nwakanma, Angela Nwosu, Helen Ovbiagele, Nduka Obaigbena, ma John Momoh. Ha erika. m nọrọ n'ụlo gị na-ahụ ndị a ma asị ,kedụ mgbe m ga-eme nke a? Ya bụ naanị ihe m chọrọ ime malite oge m bụ nwatakịrị.
Ọtụtụ anọọla ọtụtụ afọ n'ọrụ a mana o nweghị onye ma ha. Kedụ ihe i chere mere n'obere oge ị nọ n' ọrụ a, a na-anụ aha gị ebe nile?
Ihe mere ndị mmadụ iji nụwa aha m ọsọ ọsọ bụ na, maka Chukwu, o nweghị onye m ma na-arụ ọrụ dịka m , ọ kachasị oge m dị obere.
Mgbe m bidoro,anaghị m arahụ ụra. Ana m arụ ọrụ atọ otu oge.
Mgbe m na-eme NTA, m na-eme 'Thisday' n'otu oge ahụ;na-eme 'True Love' otu mgbe ahụ; na-eme 'Comet Newspaper' nke a na-akpọzị 'Nation' n'otu mgbe ahu.Nọrọ n' Unilag( University of Lagos) na-agụ ụ maka iwu.
Ya mere, nnukwu agụ ito na-agụ; ka ndị mmadụ mara aha m, ka ndị mmadụ mara ọrụ m.
Na-agbanyeghị ka ọrụ m ji n'aka ha, i bute ọrụ ọzọ, asị m gị bute ya.
Ihe mere bụ na nwa nke nke oge, ndị mmadụ na-ajụ m, ma asị ha, ị dị nkwadebe ịrụ ọrụ ka m si rụọ ọrụ oge m na-ebido? Ọtụtụ ndị mmadụ adịghị njikere.
Papa m amaghị onye ọbụla. Amụnyeghị m n'ikpo ego. Naanị otu ihe m nwere bụ ọrụ aka m. Mụ onwe tinyekwanụ ezi uchu na ya. Ya bụ ihe mere nụ.
Ị dị afọ 15, bidokwa ịrụ ọrụ na afọ 15, ị rụọ ọrụ na akwụkwọ akụkọ 'newspaper' rụọ na 'magazịne',rụọ ọrụ na TV, rụọ na redio,na-arụ ọrụ atọ n'otu mgbe, ọbụrụgodi na ị daa n'ụfọdụ n'ime ha, otu ga-aga ihu.
Otu ihe mere n'ọrụ ntaakụkọ bụ na mgbe mbanwe soshal midia bịar, ụfọdụ ndị ntaakụko ejeghị ọmụmụ ka ha were dabanye n'ihe a na-eme. Kedụ ihe i nwere ịgwa ndị ntaakụkọ enweghị nka soshal midia?
Ihe mere na ndị bụ anyị ụzọ n'ọrụ amaghị soshal midia, Ọmụma ikpe dịịrị ha.
Maka na mgbe soshal midia batara, ha na-eme oo, ọ bụ ụmụntakịrị na-eme soshal midia. Soshal midịa abụghị ọrụ ntaakụkọ.
Ihe ọhụrụ abia, ndị na-eme ihe ha na-eme ga-etinye ya n'ọrụ iji gaa n'ihu na ihe ha na-eme.
Mana ndị ụmụnne anyị tọrọ anyị n'ọrụ a, asị 'mba'. Ha ejighị soshal midia kpọrọ ihe, sị na ọ bụ ihe ụmụntakirị. Mana n'ihi na ndị dịka m, n'ihi na m na-eto eto oge ahụ, mgbe m dị 25, e nwere amamihe onye rụọla ọrụ afọ iri...
N'ihi nke a,o sirịghị m ike, ị sị ọ bụ ihe anyị na-eme kịta, ngwanụ ka anyị tinye isi na ya.
Mana ugbua, oge agabeghị.
Otu onye m na-elegara anya bụ Azu Isiekwene bụbụ 'Editor' ụlọntaakụkọ 'Punch' maburu 'Editor' ụlọntaakụkọ 'Leadership' ugbua, Ọ na-ede akwụkwọ na-asị ndị aka ochie n'ọrụ ntaakụkọ sị, ọ bụrụ na ụnụ chọrọ ịmụta soshal midia, ụnụ ga-eme nke a, ụnụ ga-eme nke a.
N'ọgbọ abụla ọgbọ. Ọ bụladị Reuben Abati, ọ nọbụ n[obi onyeisiala,mgbe ọ batara, intanet ejubeghị ebe niile, o hiwe websaitị Reuben Abati.com,youtube, ma soshal midia, o mee ya..
Ya mere ọ nweghị oge ọ ga-abụrụ ọ bụrụ na oge agaala.
Otu ezigbo ihe dị na ịntanet bụ na n'afọ ole ọbụla ị dị,ọ bụ na itinye uchu na ya, ọ ga-abara gị uru.Ọ bụ eziokwu na ndị na-eme ọrụ ntaakụkọ na ego adịrọ ya, ọ bụrụ na ị chọrọ inwe ụgbọelu nke aka gị, ọ bụghị n'ọrụ a. Ọ bụ onye ọrụ a na-anọ ọkụ n'obi, onye dịka m.
Mana intanet emeela ya ọ dị omume i nwere ike inwe ego site n'ọrụ a. Ọ bụrụ na ọ bụghị You-tube, ọ bụrụ Tiktok. Websaiti ndị mmadụ na-aga na websait kwuo dọla asatọ iji kirie ozi m tinyere.
Nke bụ eziokwu bụ na intanet kpọdoro ihe nile isi nala.
Lepụ anya n'ihe ndị mmadụ na-ekwu, kpebie ma ihe m chọrọ ime, ụzọ adị ya ka m nwee ego n'ụzọ m chọrọ inwe ego.
Otu ihe ọma dị na intanet bụ na ndị a na-akpọ 'ndị nche' (n'ọrụ ntaakụkọ) anaghị ebe ahụ.
Ndị ezinaụlọ m nile bụ n'ihi na ụfọdụ ndị dị ka mụ, ọkaiwu mana ahara m ọrụ ntaakụkọ,
N' omenala Igbo, mmadụ toruo afọ, rụọ ọrụ, kpata ego,ihe ọzọ a ga-ajụ ya bụ kedụ ezinaụlọ gị? Kedụ ihe i nwere ike ịgwa anyị?
Ị sị na m enwetala ihe nịile ọ dị mkpa na dimkpa na-enwe; ma ọrụ, ma ego…Ego mmm.ma ọrụ ee. Dịka nwanne nne na-ekwukarị, 'Chude , gịnị na-emezi?'
Ọ ga-eme. Mana ọ bụ na oge m na oge chi m. Ihe gbasara nwunye na ụmụ abụghị ihe ị ga-eme n'oge ndị mmadụ.Ọ bụ n'oge gị, oge chi gị sịrị na o ruo.
Ya mere ọ ga-aga. Mụ na nne anyị na-ekwu okwu ya mgbe nile. .Mgbe chi sị, Chude, gawa, , ọ bụrụ ya.
Ị bụ ihe Bekee na-akpọ 'influencer'. Kedụ mgbe a dọrọ gị na soshal midia kachasị metụtara gị n'ọkpụkpụ?
O nwere mgbe m mere achụmtavootu n'afọ 2015, maka ndị na-azọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2015, achọghị m ịkpọ aha ka ha ghara itigbu m.
Oge m mere achụmtavootu na 2015 (nke Buhari, mana ọ gaghị ka m si chee na ọ ga-aga.
Ndị mmadụ chere na m ga-aga otu akụkụ mana agara m akụkụ nke ọzọ.
Ka nke a mechara. Ewere rue taa, ha gbagharabeghị m maka achụmtavootu ahụ mere.
Mana e mere m ihe obi m sị ka m mee.
Ọ bụ na ọ bụghị orụ a kwụrụ gị ugwo ya?
A kwụrụ m ụgwọ ya mana a kwụọ gị ụgwọ, ọ dịghị mkpa na ị ga-ekwu maka ya.Mana anọ m na-ekwu maka ya n'ọha n'ihi na obi nabatara ya.
Mụnwa chere na 'candidate' m dị mma, m kwenyekwa na ya. M bịa jiri obi m, ma aka m, ma ndụ tinye na ikwụpụta maka onye ahụ. Emechaa ihe nile ghasaa. Were rue taa, ya bụ ihe amasịghị ndị mmadụ. Mana ọ bụ ihe ndụ pụtara; I mee ihe, I mụrụ akọ dị na ya. Gbaa mbọ mezie ọfụma oge ọzọ.
Kedụ ihe mmụta i nwetara na ya bụ ihe?
Ụmeala. Agbanyeghị ka obi gị si anọ ọkụ maka onye ọbụla, wetuo obi.O nwere ike gaa ọfụma, nwee ike ọ gaghị aga. Ya mere na kemgbe ahụ, anaghị m eme mkpọtụ candidate. Maka na nke m mere afọ iri na-abụọ gara aga, anyị ka na-ekwu ya rue ugbua.



