Gịnị bụ atụmatụ 'Temporary Protected Status' nke mba Amerịka na ihe mere Naịjirịa esoghi na ya?
Mba Amerịka wepụrụ aha mba Afrịka anọ n’akwụkwọ atụmatụ nchereoge nke na-enye ụmụafọ ha ikike ibi ma na-arụ n’Amerịka a kpọrọ ‘Temporary Protected Status (PTS).
Mba anọ nke a metụtara bụ Kameruun, Etiopịa, Somalị na Saụt Sudan nakwa ụfọdụ mba ndị si mpaghara ọzọ n’ụwa.
Ha kwuru na nke so na mgbọ ọchịchị ya na-agba iji belata etu ndị mmadụ si enubata n’Amerịka site n’ohere ọrụ enyemaka.
Gịnị bụ Temporary Protected Status (PTS)?
'Temporary Protected Status bụ atụmatụ ọrụ enyemaka nke mba Amerịka na-enye mba ndị ọzọ bụ ndị nwere nsogbu nchekwa, ọdachi sitere n’okike nakwa ọnọdụ ndị ọzọ ka ụmụafọ ha nwee ohere ịbata mba Amerịka bịa biri ma na-arụ ọrụ n’ọnọdụ nchereoge ruo mgbe nsogbu ha nwere n’obodo ha ga-ebi.
Mana nke a apụtaghị na ha enwetela akwụkwọ ikike ịnọgide a kpọrọ permanent residency maọbụ ohere ịbụzi nwafọ mba Amerịka.
Ugbua e wepụrụ ohere enyere mba ndị a, ọ pụtara na nwafọ mba ahụ na-enweghi ihe ọzọ o ji kụnye aka ịnọgide n’Amerịka ga-eso na ndị a ga-agbara ụgbọ nwamkpị.
Onye bụ nwafọ mba ndị a ma nwere ụzọ ọzọ iwu kwadoro ya iji nọgide na mba Amerịka, agaghị eso na ndị a ga-agbara ụgbọ.
Naịjirịa oso na ndị nwere ohere atụmatụ Temporary Protected Status (TPS)?
Naịjirịa esoghi na mba ndị nwere ohere ọrụ enyemaka a site n’Amerịka.
Ọtụtụ otu na-ahụ maka ikike dịịrị onye edegarala mba Amerịka akwkwọ n’oge gara aga ka ha tinye aha Naịjirịa, gbagide ụkwụ n’ọnọdụ nchekwa na ọgbaghara na-eme na Naịjirịa mana mba Amerịka anabatabeghi arịrịọ ahụ



