Ihe ị kwesịrị ịma maka Ademola Adeleke zọtara ọkwa gọvanọ Osun steeti

Sinetọ Ademola Adeleke
Mgbe e biputara ya

Ademola Jackson Adeleke nke ji ọkọlọtọ pati People's Democratic Party (PDP) zọọ ọkwa gọvanọ Osun steeti, abụrụla gọvanọ steeti ahụ dịka o meriri ya bụ ntuliaka.

Ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) kwuputere na o ji mkpokọta vootu 403,371 merie Adegboyega Oyetola nke pati APC nwetara vootu 375, 027.

O meriri Okpuruọchịchị 17 n'ime 30 dị na steeti ahụ.

Onye bụ Ademola Adeleke?

  • Aha ya bụ Ademola Jackson Nurudeen Adeleke
  • Ọ bụ Ojiegoachụego
  • A mụrụ ya n'ụbọchị 13 nke ọnwa Mee afọ 1960
  • Ọ dị Afọ 62
  • Ọ bụ onye Ede dị n'Osun steeti
  • N'afọ 2021, o nwetara nzere nke mbụ n'ihe gbasara Iwu na Ikpemkwụmọtọ na mahadum Atlanta Metropolitan State College, dị na mba Amerịka.
  • Ọ zọburu ọkwa sineti na-anọchite Osun Westị n'afọ 2017 na ntuliaka mmegharị e mere, ka nwanne ya nwoke bụ Isiaka Adeleke nwụchara.
  • Ọ zọkwara ọkwa gọvanọ Osun steeti na ntuliaka e mere n'afọ 2018, mana ọ zọtaghị ọkwa ahụ.
  • Ọ bụ nwanne nna otiegwu a ma ama bụ David Adeleke (Davido)
  • A na-etu ya "Imole de" (Ihe 'light' abịala) nakwa "dancing senator" n'ihi etu o si eme ndị mmadụ obi aṅụrị site n'ịgba egwu