Big Brother Naija 2020: Lee ihe ị kwesịrị ịma maka mmadụ 20 nọ n'ime ụlọ a

Mgbe e biputara ya

Ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na ndị Igbo karịrị dịka a malitere Big Brother Naija Season 5 n'ụbọchị 19 nke ọnwa Julaị.

Ozoemena "Ozo" Chukwu
Nkọwa foto, Ozoemena "Ozo" Chukwu dị afọ 27 bụ onye Imo steeti. Ihe ọ kachasị rite bụ ịrụrụ ngalaba na-achịkọta otu bọọlụ na Yurop bụ Uefa ọrụ na mba ofesi. Ịkọwa maka egwuregwu, ile ejije nkọwa ihe nakwa ihe nkiri ndị ọzọ na-amasị ya. O nwekwara akwa nke o ji aka ya emepụta.
Ngozi "Erica" Nlewedim
Nkọwa foto, Ngozi "Erica" Nlewedim dị afọ 26 bụ ome ejije. Ọ gụrụ maka ime ejije n'ụlọakwụkwọ a kpọrọ Met Film School dị na Lọndọn. Ọ ga-amasị ya ịbụ ome ejije a ma ama. Ọ na-amasị ya ịṅụ mmanya ma na-agba egwu n'ihu enyo.
Nelson Enwerem Prince
Nkọwa foto, Nelson Enwerem Prince dị afọ 24 bụ onye Abịa steeti. Ọ bụ "Nwoke kacha mma na Naịjiria" ugbua, dịka o meriri nke a kpọrọ "Mr Nigeria" na Bekee. Ọ bụkwa onye achụmntaego ma anya ekike nakwa, imezi ime ụlọ. Ọ bụ ọkparaeze n'ihi na nna ya bụ eze obodo ya. Igwu mmiri, iri nri nakwa ịgụ akwụkwọ/akụkọ mgbe gboo maka Afrịka nakwa ofufe na-amasị ya.
Florence Wathoni Anyansi
Nkọwa foto, Florence Wathoni Anyansi dị afọ 29. Nne ya bụ onye mba Kenya ebe nna ya bụ onye Igbo. O nwekwara otu nwa nwoke. Ọ bụ onye achụmntaego na-eji ekike akpa ego. Egwu na-amasịkwa ya. Ọ na-asụkwa asụsụ Swahili.
Tochukwu Okechukwu 'Tochi'
Nkọwa foto, Tochukwu 'Tochi' Okechukwu dị afọ 28 bụ onye Imo steeti. Ọ bụ otiegwu nakwa onye na-ere ụlọ na ala. Ihe gbasara ịkpa obi aṅụrị na-amasị ya. O kwuru na ọ na-adịtụkwa umengwụ ụfọdụ oge.
Praise Nelson
Nkọwa foto, Praise Nelson bụ ọgbaegwu si Enugwu steeti. O meriri n'asọmpi ndị na-agba egwu a kpọrọ "K-Pop World Festival", e mere na mba Saụt Koriya n'afọ 2015. Ọ gbakwara onye nke atọ n'asọmpi ndị ọgba egwu na Naịjiria n'afọ 2010. Ọ bụkwa ọkpụ ụzọ na-azụ ndị mmadụ na mmegharị ahụ.
Terseer Kiddwaya
Nkọwa foto, Terseer Kiddwaya dị afọ 27 bụ onye Benue Steeti. O kwuru na ọ bụ onye onwe ya juru afọ nakwa onye ọkụ na-anụ n'obi. Ọ mara mma ma marakwa nke a. Ime njem na-amasị ya.
Dorathy Bachor
Nkọwa foto, Dorathy Bachor dị afọ 24 bụ onye achụmntaego. O si Delta steeti. O bu n'obi imenye ndị mmadụ obi aṅụrị. Ihe ọ kachasị rite bụ ụlọọrụ o hibere nke na-ahụ maka ịzụpụtara ndị mmadụ ngwaọrụ.
Eric Akhigbe
Nkọwa foto, Eric Akhigbe dị afọ 24 bụ onye Edo steeti na-aga mahadum na University of Lagos. Ọ bụ ọkpụ ụzụ ịgbatị ahụ na-amasị. O tokwara ezigbo ogologo. O kwuru na ihere na-emekarị ya. Inwe mmeri n'asọmpi na-akpalite mmụọ ya.
Kate 'Ka3na' Jones
Nkọwa foto, Kate 'Ka3na' Jones dị afọ 26 bụ onye achụmntaego si Rivas steeti. Ọ na-ahụta onwe ya dịka nwaanyị kajara akaja. Olileanya ya bụ ịbụ onye a ma ama, ma bụrụkwa onye nwere ebe a na-emepụta akwa dị oke ọnụ na mbaụwa. Ebumnobi ya bụ irite ego a mgbe oge zuru n'ihi na ọ kpọrọ ụbịam asị.
Emuobonuvie 'Neo' Akpofure
Nkọwa foto, Emuobonuvie 'Neo' Akpofure dị afọ 26 bụ onye Delta steeti. Ọ bụ ọkwọụgbọala. Ihe gbasara mmegharị na mgbatị ahụ na-amasị ya. Ọ bụ akpa egwuregwu, ịhụnanya juru ya n'ahụ, o kwuru na ọ na-enwere ndị mmadụ ndidi mana ọ na-abụ agụ ma a bịa n'ihe ịkpa oke nakwa imegbu mmadụ. Ikwusa ihe gbasara ya maọbụ ịkọsa nke mmadụ kọọrọ ya amasịghị ya. Ihe ọ kachasị rite n'ụwa ya bụ N500,000 o ritere n'otu asọmpi ọ gara.
Nengi Rebecca Hampson
Nkọwa foto, Rebecca 'Nengi' Hampson dị afọ 22 bụ onye achụmntaego. O si Bayelsa steeti. O so n'ụmụnwaanyị ise ikpeazụ a họpụtara mgbe e mere asọmpi nwaanyị kacha maa mma na Naịjirịa (MBGN) n'afọ 2017. Ịmụta ihe ọhụrụ, ime njem, ebe dị ọcha na egwuregwu na-enye obi aṅụrị na-amasị ya. Ụdịrị nwoke masịrị ya bụ nke abụghị "aka gọm".
Timmy 'Trikytee' Sinclair
Nkọwa foto, Timmy 'Trikytee' Sinclair dị afọ 35 si Bayelsa steeti. Ọ bụ onye na-eji ejije na egwu akọ akụkọ nakwa ekwuputa ebumnuche ya. Ọ sị na ọ dị ka ụsụ - na ọ bụghị anụ elu nke o ji abụ onye ala, na e nweghi ebe ọ kwụ akwụ n'ọha. Nri na-amasịkwa ya.
Boluwatife 'Lilo' Aderogba
Nkọwa foto, Boluwatife 'Lilo' Aderogba dị afọ 23 bụ onye ọkachamara n'ihe gbasara ụdịrị nri onye kwesịrị iri. O si Legọs steeti. Ọ bụkwa onye achụmntaego. Ihe ọ kachasị rite bụ ibido ihe nke aka ya. Ọ sị na "Amara Chineke zuru ya ahụ".
Aisha 'Kaisha' Umaru
Nkọwa foto, Aisha 'Kaisha' Umaru bụ onye achụmntaego dị afọ 25. Nna ya bụ onye Sokoto steeti ebe nne ya bụ onye Igbo. Ọ sị na nri na-edozi ahụ, ịgụ egwu na ịpụ ọrịrị na-amasị ya. Ọ na-atụkwa egwu Chineke.
Lucy Essien
Nkọwa foto, Lucy Essien dị afọ 30 bụ onye achụmntaego si steeti Krọs Riva. Ọ sị na ọ naghị achọ okwu mana onye akpala ya bụ nwa agụ aka n'ọdụ, makana ọ ga-egosi onye ahụ ihe o ji bụrụ agụ. O kwuru na o kwenyere n'akụkọ ifo. Ezigbo nri na-amasịkwa ya.
Olamilekan 'Laycon' Agbeleshe
Nkọwa foto, Olamilekan 'Laycon' Agbeleshe dị afọ 26 si Legọs. Ọ bụ otiegwu nwere olileanya iji ọgbakọ a kwalite aka ọrụ ya. Ọ gụrụ ihe Bekee na-akpọ "Philosophy" na mahadum. Ọ bụ otu onye ụfodụ ndị mmadụ lelịrị anya mgba ọ banyere n'ime ụlọ, mana ha gbanwere ebumnuche ha ozugbo ha hụrụ na o nwekwara ọgụgụ isi. Ịkpa nkata maka aramara na-amasị ya. Ihe ọ kachasị rite bụ egwu ya a kpọrọ "Fierce" nke ndị MTV Base kpọrọ ọnwa isii n'agba egwu iri a kacha achọ.
Tolani 'Tolanibaj' Shobajo
Nkọwa foto, Tolani 'Tolanibaj' Shobajo dị afọ 27 bụ otu onye ihe gbasara ịkpa obi aṅụrị doro anya. Ọ bụ "ọbata o su" ma ya na ndị mmadụ gbakọọ ịkpa obi aṅụrị. Ịgba egwu na isi nri masịrị ya nke ukwu. Tolanibaj sị na ọ bụ maka ịmabute ego a ka o ji bịa n'ihi na ọ hụrụ ego n'anya. Ọ sịkwa na ihe gbasara Naira Marley masịkwara ya.
Ezekiel Bright Osemudiame 'Brighto'
Nkọwa foto, Ezekiel Bright 'Brighto' Osemudiame dị afọ 29 bụ onye ọrụụgbọmmiri si Edo steeti. Ọ gụrụ 'Marine Engineering' na mahadum Arab Academy for Science Technology and Maritime Transport dị na mba Ijipt. O kwuru na ihe gbasara ịkpa obi aṅụrị na-amasị ya. Ihe ọ kachasị rite na ndụ ya bụ inweta ohere ịga mahadum na mba na-abụghị Naịjiria n'efu.
Victoria "Vee" Adeyele
Nkọwa foto, Victoria "Vee" Adeyele bụ nwaada dị afọ 23 na-eti egwu. A mụrụ ya na Lọndọn mana ọ kwaghachịtara Legọs otu afọ gara aga ka o nwee ike itinye uchu n'egwu ọ na-agụ. O kwuru na ihe na-aka amasị ya bụ ime ejije, nakwa ya na ndị mmadụ inwe mmekọrịta nakwa ịkpa ndị mmadụ ọchị. O kwuru na ọ yịtụbeghi nwoke karịa ọnwa isii. O kwuru na ihe ọ kachasị rite na ndụ ya bụ ịgụ egwu n'emume a kpọrọ Palmwine Music Festival n'afọ gara aga.